15 Eze Ijipt we si ndinyom Hibru ndi nēle ime, ndi aha otù onye nime ha bu Shifra, aha nke onye nke-abua bu kwa Pua:
16 ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n'elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu.
17 Ma ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, ha emeghi kwa dika eze Ijipt gwara ha, ma ha debere umu-ndikom ndu.
18 Eze Ijipt we kpọ ndinyom ahu nēle ime, ọ si ha, Gini mere unu ji me ihe a, we debe umu-ndikom ndu?
19 Ndinyom nēle ime we si Fero, N'ihi na ndinyom Hibru adighi ka ndinyom Ijipt; n'ihi na ndi nwere ndu ka ha bu, ha nāmu kwa nwa tutu ndinyom nke nēle ime abiakute ha.
20 Chineke we me ndinyom nēle ime nma: ndi Israel we ba uba, nwe kwa ume nke-uku.
21 O rue, n'ihi na ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, na O mere èzí-na-ulo nye ha.