15 Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n'osisi ma-ọbu n'ihe-ọkukú nke ubi, n'ala Ijipt nile.
16 Fero we me ngwa ikpọ Moses na Eron, si, Eme-hiewom megide Jehova, bú Chineke-unu, megide kwa unu.
17 Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a.
18 Ọ we si n'ebe Fero nọ pua, riọ Jehova aririọ.
19 Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n'Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt.
20 Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel.
21 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n'elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka.