8 Ewe me ka Moses na Eron biaghachikute Fero: ọ si ha, Jenu, fè Jehova, bú Chineke-unu: ònye na onye bu ndi nēje?
9 Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n'ihi na ememe Jehova ka ayi nwere.
10 Ọ si ha, Ka Jehova diyere unu otú a, dika m'gēzipu unu na umu-ntakiri-unu: lenu anya, n'ihi na ihe ọjọ di n'iru unu.
11 Ọ gaghi-ndi otú a: biko, jenu, unu, bú ndikom, fè Jehova; n'ihi na nke ahu ka unu onwe-unu nāchọ. Ewe chupu ha n'iru Fero.
12 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu ala Ijipt iweta igurube, ka ha we rigota n'elu ala Ijipt, rie-ihe-ọkukú ọ bula nke ala, bú ihe nile nke ákú-miri-ígwé ahu rapuru.
13 Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n'ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube.
14 Igurube we rigota n'elu ala Ijipt nile, be n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt: ha di arọ́ nke-uku; tutu ha ọ dighi igurube di otú a, dika igurube ahu, mb͕e ha gasiri ọ gaghi-adi kwa igurube otú a.