15 o rue, mb͕e Fero mere ka o sie ike, bú izipu ayi, na Jehova b͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma nwa madu buru uzọ mu, ma nwa anumanu buru uzọ mu: n'ihi nka ka mu onwem nēwere nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú oké, chuara Jehova àjà; ma ọkpara ọ bula nke umum, anamab͕aputa ya.
16 Ọ gābu kwa ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua: n'ihi na ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt puta.
17 O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n'uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n'ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n'Ijipt:
18 ma Chineke dughariri ndi Israel, n'uzọ ọzara, n'uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n'ala Ijipt rigoputa.
19 Moses we buru ọkpukpu Josef mb͕e ọ jere: n'ihi na ọ mere ka umu Israel ṅusie iyi ike, ọ si, Chineke gēleta unu n'ezie; unu gēme kwa ka ọkpukpum so unu si n'ebe a rigopua.
20 Ha we si na Sukot bulie ije-ha, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, na nsọtu ọzara.
21 Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali: