1 Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Gwa umu Israel ka ha chigharia, ma ulo-ikwū-ha n'iru Pai-hahairot, n'etiti Migdol na oké osimiri, n'iru Beal-zefon: na ncherita-iru ya ka unu gāma ulo-ikwū-unu n'akuku oké osimiri.
3 Fero gēkwu kwa okwu bayere umu Israel, si, Ndi atuhiworo n'ala ka ha bu, ọzara emechibidowo ha nime.
4 M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a.
5 Ewe gosi eze Ijipt na ndi Israel ab͕alagawo: obi Fero na ndi-orù-ya we chigharia imegide ndi Israel, ha si, Gini bu nka ayi meworo, na ayi ezipuwo Israel n'ifè ayi?
6 Ọ we jikere ub͕ọ-ala-ya, chiri kwa ndi-ya iso ya:
7 o chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri arọputaworo, na ub͕ọ-ala nile nke Ijipt, na ndi-isi-agha n'elu ha nile.