1 Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n'Ijipt puta.
2 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were Zipora, bú nwunye Moses, mb͕e o zipusiri ya,
3 na umu-ya ndikom abua; nke aha otù nime ha bu Giashom; n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'buworo n'ala ọzọ:
4 aha nke ibe-ya bu kwa Elieza; n'ihi na ọ siri, Chineke nke nnam bu iye-akam, Ọ we naputam na mma-agha Fero:
5 Jetro, bú nna nwunye Moses, we biakute Moses, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya, nime ọzara ebe ya onwe-ya maworo ulo-ikwū, n'ugwu nke Chineke.
6 Ọ si Moses, Mu onwem, nna nwunye-gi, bú Jetro, abiakutewom i, mu na nwunye-gi, na umu-ya ndikom abua tiyere ya.
7 Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū.