9 Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n'aka ndi Ijipt.
10 Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n'okpuru aka ndi Ijipt.
11 Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.
12 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke.
13 O rue, n'echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n'akuku Moses si n'ututu rue anyasi.
14 Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n'akuku gi si n'ututu rue anyasi?
15 Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase: