14 Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n'ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N'ezie amawo okwu a.
15 Fero we nu okwu a, ọ we chọ ib͕u Moses. Moses we b͕apu n'iru Fero, nọdu n'ala Midian: o we nọdu ala n'akuku olùlù-miri.
16 Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua.
17 Ndi-ọzùzù-aturu we bia, chupu ha: ma Moses biliri, zọputa ha, me ka ìgwè ewu na aturu-ha ṅua miri.
18 Ha we biakute Reuel, bú nna-ha, ọ si, Gini mere unu ji bia ngwa ngwa ta?
19 Ha si, Nwoke Ijipt o setara ayi miri nke-ọma, me ka ìgwè ewu na aturu-ayi ṅua.
20 Ọ si umu-ya ndinyom, Òle ebe ọ nọ kwa? n'ìhi gini bu nka na unu arapuwo nwoke ahu? kpọnu ya, ka o we rie nri.