15 Onye nēti nna-ya, ma-ọbu nne-ya, ihe, aghaghi ime ka ọ nwua.
16 Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.
17 Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.
18 Mb͕e ndikom nēse okwu, ma otù nime ha ewere nkume ma-ọbu iwere ọkpọ ti ibe-ya, ma ọ nwughi, ma o dina n'ihe-ndina ọria:
19 ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.
20 Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n'aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n'okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya.
21 Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu.