5 Mb͕e i huru inyinya-ibu nke onye nākpọ gi asì ka ibu-ya nānyib͕u ya, ma i nāchọ ighara itọpuru ya ibu ahu, i ghaghi iyere ya aka itọpu ya.
6 Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n'ise-okwu-ya.
7 I gānọpuru okwu-ugha n'ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n'ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume.
8 Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.
9 Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n'ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n'ihi na ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.
10 Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ala-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya:
11 ma n'arọ nke-asa i gārapu ya, me ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ka ndi-ob͕eye nke ndi-gi we rie ihe: anu-ọhia gēri kwa ihe ha rifọrọ. Otú a ka i gēme kwa ubi-vine-gi, me kwa ubi-olive-gi.