1 Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.
2 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile gēnwe.
3 Ákwà-nkwuba ise ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya; ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya.
4 I gēji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu; otú a ka i gēme kwa n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.
5 Ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme kwa nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua; anya-nko gēcherita onwe-ha iru, otù na ibe-ya.