19 Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.
20 I gēme-kwa-ra akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu, bú akuku Ugwu, orú ibo:
21 na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.
22 Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka i gēme-kwa-ra ibo isi.
23 Ibo abua ka i gēme-kwa-ra nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya.
24 Ha gābu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua gābu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka ọ gādiri ha abua; nkuku abua ahu ka ha gādiri.
25 Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.