25 Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.
26 I gēme kwa nkpọrọ osisi acacia; ise ka i gēmere ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,
27 nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke ebe-obibi, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu.
28 Nkpọrọ etiti nke di n'etiti ibo, anēme kwa ya ka o si n'otù nsọtu gabiga rue nsọtu ọzọ.
29 I gāmachita kwa ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu: i gāmachita kwa nkpọrọ nile ọla-edo.
30 I gēwuli kwa ebe-obibi ahu elu dika ọdidi-ya ekpere n'ikpe si di nke emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a.
31 I gēme kwa ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ gābu ọlu onye-ọ̀kà, ọ gēme ya ka o yie cheru-bim: