13 Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.
14 Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya.
15 Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu.
16 Mbadamba nkume ahu, ọlu Chineke ka ha bu; odide ahu kwa, odide Chineke ka ọ bu, bú eb͕ub͕u eb͕uru n'elu mbadamba nkume abua ahu.
17 Joshua we nu olu ndi Israel ka ha nēti nkpu, ọ we si Moses, Olu agha di n'ọmuma-ulo-ikwū.
18 Ọ si, Ọ bughi olu ndi nāza n'idi-ike, ọ bughi kwa olu ndi nāza n'adighi-ike; olu ndi nāza n'ibù abù ka mu onwem nānu.
19 O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n'aka-ya, tupia ha n'okpuru ugwu ahu.