1 Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, si n'ebe a rigo, gi onwe-gi na ndi ahu nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ya:
2 M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:
3 rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya: n'ihi na M'gaghi-arigo n'etiti gi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu: ka M'we ghara ime ka i gwusia n'uzọ.
4 Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n'aru ya.