14 Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike.
15 Ọ si Ya, Ọ buru na iru-Gi adighi-eje, emela ka ayi si n'ebe a rigo.
16 N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n'iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n'ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n'ebe ndi nile nọ ndi bi n'elu uwa.
17 Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.
18 Ọ si, Biko, me ka m'hu ebube-Gi.
19 Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya.
20 Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n'ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu.