11 Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi.
12 Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi:
13 kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:
14 n'ihi na i gaghi-akpọ isi ala nye chi ọzọ: n'ihi na Jehova, Nke Onye-ekworo bu aha-Ya, Chineke ekworo ka Ọ bu:
15 ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;
16 i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.
17 Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.