2 Nọ na njikere rue ututu, rigota n'ugwu Sainai n'ututu, guzorom onwe-gi ọtọ n'ebe ahu n'elu ugwu ahu.
3 Ọ dighi kwa onye ọ bula gēsoro gi rigota, ọzọ kwa, ka aghara ihu onye ọ bula n'ugwu ahu nile; ọzọ, ìgwè ewu na aturu ma -ọbu ìgwè ehi atala nri n'akuku ugwu ahu.
4 Ọ we wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu; Moses we bilie n'isi-ututu, rigorue ugwu Sainai, dika Jehova nyere ya iwu, o were kwa mbadamba nkume abua n'aka-ya.
5 Jehova we ridata n'igwe-oji, o guzo onwe-ya n'ebe Ọ nọ n'ebe ahu, we kpọkue aha Jehova.
6 Jehova we gabiga n'iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere na ezi-okwu;
7 Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.
8 Moses we me ngwa, rube isi-ya n'ala, kpọ isi ala.