1 Moses we kpọkọta nzukọ nile nke umu Israel, si ha, Ndia bu okwu nke Jehova nyeworo n'iwu, ka unu me ha.
2 Ubọchi isi ka agēje ozi, ma n'ubọchi nke-asa unu gēnwe ubọchi nsọ, bú ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēme ka ọ nwua.
3 Unu afunwula ọku n'ebe-obibi-unu nile n'ubọchi-izu-ike.
4 Moses we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, si,