3 Unu afunwula ọku n'ebe-obibi-unu nile n'ubọchi-izu-ike.
4 Moses we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, si,
5 Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;
6 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;
7 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;
8 na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me;
9 na nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.