14 O me-kwa-ra ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka o mere ha.
15 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na iri, cubit anọ ka obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu nwere.
16 O jikọta-kwa-ra ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche.
17 O me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, ọ me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.
18 O me-kwa-ra ọgu nko ọla abua na iri, ijikọta ulo-ikwū ahu ka ọ we buru otù.
19 O were mere ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.
20 O we mere ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.