13 Akuku Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu, nwekwara ọgu cubit abua na iri.
14 Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya nwere; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ;
15 akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya nwekwara: n'aka-nri na n'aka-ekpe nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu ka ákwà-ngechi cubit iri na ise di; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ.
16 Ákwà-ngechi nile nke ogige ahu buruburu bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.
17 Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu.
18 Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu.
19 Ide-ha di anọ, ukwu-ha di kwa anọ, ha bu ọla; nkpọye nile ha bu ọla-ọcha, ihe-nmachita nke isi-ha na ngegide nile ha bu kwa ọla-ọcha.