26 otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n'isi onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, n'isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.
27 Ọgu talent ọla-ọcha ise ahu we buru iwu ukwu nile nke ibo nke ebe nsọ ahu, na ukwu nile nke ide nke ákwà-nb͕ochi ahu; ọgu ukwu ise ka ọgu talent ise ahu nwere, otù talent diri otù ukwu.
28 Nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise ahu ka o ji kwa mere ide ahu nile nkpọye, machita kwa isi-ha, mekwara ha ihe-ngegide.
29 Ọla nke àjà-ofufé ahu di kwa ọgu talent atọ na iri, na nnù shekel isi.
30 O ji ya me ukwu nile nke ide ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, na ebe-ichu-àjà ọla, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu,
31 na ukwu nile nke ide ogige ahu buruburu, na ukwu nile nke ide ọnu-uzọ-ama ogige ahu, na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu, na ǹtú nile nke ogige ahu buruburu.