11 Ariri nke-abua bu emerald na sapphire na diamond.
12 Ariri nke-atọ bu jacinth na agate na amethyst.
13 Ariri nke-anọ bu beryl na onyx na jasper: etiyere ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha.
14 Nkume ahu di ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha diri ebo iri na abua ahu.
15 Ha mekwara n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.
16 Ha me-kwa-ra ihe ọla-edo abua akpara akpà, na nb͕a-aka ọla-edo abua: ha we tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.
17 Ha tiye-kwa-ra iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.