22 Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu;
23 ọnu uwe-nwuda ahu di n'etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya.
24 Ha mekwara n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma.
25 Ha mekwara ataṅu ọla-edo anāgwaghi agwa, tiye ataṅ ahu n'etiti pomegranate ahu n'elu ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, n'etiti pomegranate ahu;
26 otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu.
27 Ha we mere Eron, mekwara umu-ya ndikom, uwe-ime ahu, ha bu ezi ákwà ọcha, ọlu nke ọkpa-ákwà,
28 na ákwà-nkukù-isi ahu, ọ bu ezi ákwà ọcha, na ihe ahu mara nma ike n'isi, ha bu ezi ákwà ọcha, na uwe-ukwu ahu nke ezi ákwà ọcha, ha bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma,