11 Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n'onwe-unu n'ebe ọ bula unu gāchọta ya, n'ihi na ọ dighi ihe agāgubì n'òfùfè-unu.
12 Ndi Israel we b͕asa n'ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n'ọnọdu okporo-ọka.
13 Ndi nāchi ha n'ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di.
14 Ewe tie ha ihe, bú ndi nēle umu Israel anya n'ọlu, nke ndi Fero ndi nāchi umu Israel n'ihe-ike doro isi-ha, ewe si ha, Gini mere unu aluzughi òkè-unu ma nyahuru ma ta, n'ikpu brick dika na mb͕e gara aga?
15 Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we bia tikue Fero, si, N'ìhi gini ka i nēme ndi-orù-gi otú a?
16 Ọ dighi okporo-ọka anēnye ndi-orù-gi, ma ha nāsi ayi, Kpuanu brick: le kwa, anēti ndi-orù-gi ihe; ma ndi nke gi emehiewo.
17 Ma ọ siri, Ndi-ume-ngwu ka unu bu, ndi-ume-ngwu ka unu bu: n'ihi nka ka unu onwe-unu nāsi, Ka ayi je, chuara Jehova àjà.