15 Umu-ndikom Simeon kwa; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu: ndia bu ab͕uru Simeon.
16 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di; Giashon, na Kohat, na Merari: arọ ndu Livai di ọgu arọ isi na iri na asa.
17 Umu-ndikom Giashon; Libni, na Shimai, dika ab͕uru nile ha si di.
18 Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ.
19 Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di.
20 Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.
21 Umu-ndikom Izha kwa; Kora, na Nefeg, na Zikri.