25 Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di.
26 Ndia bu Eron na Moses ahu, ndi Jehova siri, Menu ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.
27 Ha onwe-ha bu ndi nāgwa Fero eze Ijipt okwu, ime ka umu Israel si n'Ijipt pua: ndia bu Moses na Eron ahu.
28 O rue, n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ala Ijipt,
29 na Jehova gwara Moses okwu, si, Mu onwem bu Jehova: gwa Fero eze Ijipt okwu nile nke Mu onwem nāgwa gi.
30 Moses we si n'iru Jehova, Le, mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu, Fèro gēsi kwa aṅa gem nti?