7 M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.
8 M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova.
9 Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike.
10 Jehova we gwa Moses okwu, si,
11 Bà gwa Fero, bú eze Ijipt, okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya.
12 Moses we kwue n'iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu?
13 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, nye ha iwu n'ebe umu Israel nọ, na n'ebe Fero eze Ijipt nọ, ime ka umu Israel si n'ala Ijipt pua.