12 Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.
13 Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
14 N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile.
15 N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa:
16 ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.
17 Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha?
18 Le, dika mb͕e a echi M'gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n'Ijipt site n'ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a.