15 N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.
16 Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha.
17 Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya.
18 Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi.
19 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia.
20 Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n'ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n'oge-ha.
21 Ndi-Ju we nēle anya Zakaraias, o ju-kwa-ra ha anya n'ebe ọ nānọ ọdù n'ulo nsọ.