38 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.
39 O we rapu ha je kwa ọzọ, kpe ekpere, nēkwu otù okwu ahu.
40 O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di oké arọ́; ha amataghi kwa ihe ha gāza Ya.
41 O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie.
42 Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.
43 Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ.
44 Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je.