35 Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n'etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi.
36 O we kuru nwatakiri debe ya n'etiti ha: mb͕e O kusiri ya n'aka-Ya, Ọ si ha,
37 Onye ọ bula nke gānara otù nime umu-ntakiri di otú a n'aham nke-ọma, ọ bu Mu onwem ka Ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma, ọ bughi Mu ka ọ nānara nke-ọma, kama ọ bu Onye ziterem.
38 Jọn siri Ya, Onye-ozizí, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi: ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi.
39 Ma Jisus siri, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke gālu ọlu di ike n'aham, nke gāpu kwa ikwujọm ọsọsọ.
40 N'ihi na onye nādighi-emegide ayi diri ayi.
41 N'ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n'ihi na unu bu ndi nke Kraist, n'ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.