9 Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.
10 Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si,Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi,Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.
11 N'ezie asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze elu-igwe ka ya uku.
12 Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.
13 N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn.
14 Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.
15 Onye nwere nti inu ihe, ya nu.