20 Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru.
21 Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.
22 Ngwa ngwa O we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ, rue mb͕e Ya onwe-ya gēzilaga ìgwè madu nile.
23 Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n'elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n'ebe ahu.
24 Ma ub͕ọ ahu di n'etiti oké osimiri ub͕u a, ebili-miri nēmekpa kwa ya aru; n'ihi na ifufe nēfegide ya.
25 Ma na nche nke-anọ n'abali Ọ biakutere ha, nēje ije n'elu oké osimiri.
26 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n'egwù.