25 Ma na nche nke-anọ n'abali Ọ biakutere ha, nēje ije n'elu oké osimiri.
26 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n'egwù.
27 Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu.
28 Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n'elu miri.
29 Ọ si, Bia. Pita we si n'ub͕ọ rida, je ije n'elu miri ahu, ijekuru Jisus.
30 Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam.
31 Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua?