10 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Ọ buru na okwu di otú a n'etiti nwoke na nwunye-ya, ọ baghi urù ilu nwunye.
11 Ma Ọ siri ha, Ọ bughi madu nile nānagide okwu a, kama ọ bu ndi enyeworo ya.
12 N'ihi na ndi-onozi di, ndi amuru otú a site n'afọ nne-ha: ndi-onozi di kwa, ndi emere onozi site n'aka madu: ndi-onozi di kwa, ndi mere onwe-ha onozi n'ihi ala-eze elu-igwe. Onye puru inagide ya, ya nagide.
13 Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.
14 Ma Jisus siri, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a.
15 O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n'ebe ahu pua.
16 Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi?