25 Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Unu amatawo na ndi bu isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha: ndi uku ha nāchi kwa ha.
26 Ọ bughi otú a ka ọ gādi n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi;
27 ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gābu orù-unu:
28 dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.
29 Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya.
30 Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.
31 Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.