28 Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu.
29 N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.
30 Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n'ihe n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.
31 Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya:
32 ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu:
33 Ọ gēdebe kwa aturu n'aka-nri-Ya, ma umu-ewu n'aka-ekpe.
34 Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa: