30 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
31 Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.
32 Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.
33 Ma Pita zara, si Ya, Ọ buru na agēme madu nile ka ha ma n'ọnyà n'aru Gi, agaghi-eme ka mu onwem ma n'ọnyà mb͕e ọ bula.
34 Jisus si ya, N'ezie asim i, na n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá, i gāgọnarim ub͕ò atọ.
35 Pita si Ya, Ọ buru na ọ di nkpà ọbuná ka m'so Gi nwua, agaghm-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ndi ahu nile ndi nēso uzọ-Ya kwuru.
36 Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere.