39 O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.
40 O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour?
41 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.
42 O we rapu ha je kwa ọzọ nke ub͕ò abua, kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na nka apughi igabiga, ma ọ buru na aṅughm ya, ka eme ihe I nāchọ.
43 O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di arọ́.
44 O we rapu ha ọzọ, je, kpe ekpere nke ub͕ò atọ, nēkwu otù okwu ahu ọzọ.
45 Mb͕e ahu Ọ biakute ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: le, oge hour nkem di nso, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie.