26 Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe.
27 Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n'ebe Ọ nọ.
28 Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie.
29 Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju!
30 Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi.
31 Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe.
32 Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya.