2 Absalom we bilie n'isi-ututu, guzo n'akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.
3 Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n'ebe eze nọ.
4 Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n'ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m'we kpọ ya onye ezi omume!
5 O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu.
6 Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n'ori.
7 O rue, n'ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m'je kwughachi nkwam, nke, m'kwere Jehova, nime Hebron.
8 N'ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m'biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m'laghachi na Jerusalem n'ezie, m'gēfè kwa Jehova òfùfè.