26 Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n'ihi na orù-gi siri, Ka m'jikwara onwem inyinya-ibu, ka m'we nọkwasi ya, soro eze je; n'ihi na orù-gi dara ngwurọ.
27 O we kwulu orù-gi n'ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n'anya-gi.
28 N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?
29 Eze we si ya, N'ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu.
30 Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n'ulo-ya n'udo.
31 Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n'ofè Jọdan.
32 Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n'ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.