27 Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.
28 Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu:
29 ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.
30 Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.
31 Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.
32 Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà.
33 Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si,Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?