32 Ma n'okwu nka unu ekweghi na Jehova, bú Chineke-unu,
33 Onye nēje n'iru unu n'uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n'ọku n'abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n'igwé-oji ahu n'ehihie.
34 Jehova we nu olu okwu nile unu, O we we iwe, ṅua iyi, si,
35 Ọ dighi otù nwoke nime ndikom ndia nke ọb͕ọ ọjọ nka gāhu ezi ala ahu ma-ọli, bú ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha,
36 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu
37 Ọ bu kwa mu ka Jehova wesara iwe n'ihi unu, si, Gi onwe-gi kwa, i gaghi-abà n'ebe ahu:
38 Joshua nwa Nun, nke nēguzo n'iru gi, ya onwe-ya gābà n'ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n'ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya.