Deuteronomi 8 IGBOB

1 Ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, unu gēlezi anya ime ya, ka unu we di ndu, ba uba, we ba nime, nweta kwa ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha.

2 I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe.

3 O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu.

4 Uwe-nb͕okwasi-gi akapughi nká n'aru gi, ukwu-gi azaghi kwa aza, ọgu arọ abua ndia.

5 I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti.

6 I gēdebe kwa ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, ka i we je ije n'uzọ-Ya nile, tu kwa egwu Ya.

7 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nēme ka i ba n'ezi ala, bú ala iyi miri, na nke isi-iyi na ob͕u-miri, nāputa na ndagwurugwu na n'ugwu:

8 ala nke ọka wheat na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi olive nēnye manu, na nke manu-aṅu;

9 ala nke ọ bughi n'idi-ukọ ka i gēri nri nime ya, ọ dighi ihe ọ bula gākọ gi nime ya; ala nke nkume-ya bu ígwè, nke i gēgwuputa kwa ọla n'ugwu-ya.

10 I gēri kwa, afọ gēju kwa gi, i gāgọzi kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'elu ezi ala ahu nke O nyeworo gi.

11 Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta:

12 ka o we ghara ibu, mb͕e i nēri ihe, riju afọ, wu kwa ezi ulo, we biri nime ha:

13 mb͕e ìgwè ehi-gi na ìgwè ewu na aturu-gi nāba kwa uba, mb͕e ọla-ọcha na ọla-edo nāba-kwa-ra gi uba, mb͕e ihe nile i nwere nāba kwa uba;

14 na obi-gi gādi elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta;

15 Onye nēme ka i je ije n'ọzara uku ahu nke di egwu, nke agwọ nke yiri ọku na akpi di nime ya, na ala akpiri-ikpọ-nku nke miri nādighi ya; Onye nēme ka miri si n'oké nkume ọmu ahu putara gi;

16 Onye nēme ka i rie manna n'ọzara, nke nna-gi-hà nāmaghi; ka O we weda gi n'ala, ka O we nwa kwa gi, ime gi nma n'ikpe-azu-gi:

17 i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a.

18 Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.

19 Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we nējeso chi ọzọ, fè ha òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, ab͕awom àmà megide unu ta na unu aghaghi ila n'iyì.

20 Dika mba ahu ndi Jehova nēme ka ha la n'iyì n'iru unu, otú a ka unu gāla n'iyì; n'ihi na unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34