Deuteronomi 20 IGBOB

1 Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa.

2 O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu,

3 si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha;

4 n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.

5 Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.

6 Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.

7 Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya.

8 Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n'ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya.

9 O gēru kwa, mb͕e ndi-ọchi-agha gwabisiri ndi Israel okwu, na ha gēme ndi-isi nke usu nile nke ndi-agha ka ha buru ndi-nlekọta nēlekọta ndi Israel.

10 Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo.

11 O gēru kwa, ọ buru na ọ za gi okwu udo, meghe-kwa-ra gi uzọ-ya, ọ gēru kwa, na ndi nile anāhuta nime ya gāghọrọ gi ndi nēfè òfùfè, ha gēfè kwa gi òfùfè.

12 Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n'udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n'agha:

13 Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n'aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula:

14 nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15 Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia.

16 Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n'obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa.

17 N'ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu:

18 ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.

19 Mb͕e i gānọchigide obodo n'agha ọtutu ubọchi, n'ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n'ifekwasi ha anyu-ike; n'ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n'ihi na osisi nke di n'ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n'iru gi na nnọchigide-n'agha ahu?

20 Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34