Deuteronomi 19 IGBOB

1 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba ahu, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ala-ha, i we napu ha ala-ha, we biri n'obodo nile ha, na n'ulo nile ha;

2 i gākpaputara onwe-gi obodo atọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ka i we nweta ya.

3 I gēdoziri onwe-gi uzọ, kè kwa ókè-ala nke ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēme gi ka i keta, uzọ atọ, ka ob͕u-madu ọ bula we b͕alaga n'ebe ahu.

4 Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n'ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;

5 dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n'oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n'osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n'otù nime obodo ndia, we di ndu:

6 ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

7 N'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.

8 Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;

9 mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n'obodo atọ ndia:

10 ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n'isi.

11 Ma mb͕e nwoke ọ bula bu onye nākpọ madu-ibe-ya asì, o we che ya anwu, bilie megide ya, tipu ndu-ya, o we nwua; ob͕u-madu ahu we b͕alaga n'otù nime obodo ndia:

12 ndi-okenye obodo-ya gēzì kwa kpọputa ya n'ebe ahu, were ya nye n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, ka o we nwua.

13 Anya-gi agaghi-emere ya ebere, ma i gēkpochapu n'Israel ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ, ka o we diri gi nma.

14 Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.

15 Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n'ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike.

16 Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga;

17 ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n'iru Jehova, n'iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu;

18 ndi-ikpé gaju kwa ase nke-ọma: ma, le, asi na onye-àmà ahu bu onye-àmà ugha, nke b͕agideworo nwa-nne-ya àmà ugha;

19 unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

20 Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n'etiti gi.

21 Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34