Deuteronomi 15 IGBOB

1 N'ọgwugwu arọ asa i gēme nrapu.

2 Nka bu kwa okwu nrapu ahu: onye-nbinye ọ bula gārapu ihe nke o nēbinye ab͕ata-obi-ya; ọ gaghi-eji ab͕ata-obi-ya na nwa-nne-ya n'ihe-ike; n'ihi na akpọsara nrapu nye Jehova.

3 Onye ala ọzọ ka i gēji n'ihe-ike: ma ihe ọ bula i nwere nke di n'aka nwa-nne-gi, aka-gi gārapu ya;

4 ma-ọbughi mb͕e ob͕eye nādighi n'etiti gi; (n'ihi na Jehova aghaghi igọzi gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi dika ihe-nketa ka i we nweta ya;)

5 nání ọ buru na i ge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, nke-ọma, ilezi anya ime ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.

6 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi, dika Ọ gwara gi okwu: i gānara kwa ọtutu mba ihe-ibe, ma gi onwe-gi agaghi-ab͕a ihe n'ibe; i gāchi kwa ọtutu mba, ma ha agaghi-achi gi.

7 Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:

8 kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n'ọnọdu ihe-ibe-ya.

9 Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n'obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n'aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.

10 I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.

11 N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.

12 Mb͕e agērenye gi nwa-nne-gi, bú nwoke Hibru, ma-ọbu nwayi Hibru, o we fè gi òfùfè arọ isi; n'arọ nke-asa i gēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya.

13 Ma mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n'aka efu:

14 i gēsi n'ìgwè ewu na aturu-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-ọka-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi, nyebiga ya okè; ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, ji gọzie gi ka i gēnye ya.

15 I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, b͕aputara gi: n'ihi ya ka mu onwem nēnye gi ihe a n'iwu ta.

16 Ọ gēru kwa, mb͕e ọ gāsi gi, M'gaghi-apu n'ebe i nọ; n'ihi na ọ nāhu gi na ulo-gi n'anya, n'ihi na ọ diri ya nma n'ebe i nọ;

17 i gēwere kwa arà, rapue nti-ya na ọnu-uzọ, ọ gābu-kwa-ra gi orù mb͕e ebighi-ebi. Ọ bu kwa otú a ka i gēmere orù-gi nwayi.

18 Ọ gaghi-adi ike n'anya-gi, mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya; n'ihi na okpukpu ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu ka o fèworo gi òfùfè arọ isi: Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi kwa gi n'ihe nile nke i nēme.

19 Nwa ọ bula, bú oké, nke eburu uzọ mu, nke agāmu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, i gēdoro ya Jehova, bú Chineke-gi, nsọ: ejila nwa nke ehi-gi buru uzọ mu lu ọlu-ubi, akpacha-kwa-la aji nke nwa eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu-gi.

20 N'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n'ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi.

21 Ma mb͕e ọlu di n'aru-ya, dika ngwurọ ma-ọbu ìsì, ọlu ọ bula nke jọrọ njọ, achurula ya Jehova, bú Chineke-gi.

22 Nime ọnu-uzọ-ama-gi nile ka i gēri ya: onye ruru árú na onye di ọcha n'otù uzọ ahu, dika mb͕ada, na dika ele.

23 Nání na i gaghi-eri ọbara-ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34